2024
Vol 8, No 2 (2024): ODEZURUIGBO: AN INTERNATIONAL JOURNAL OF IGBO, AFRICAN AND COMMUNICATION STUDIES
Odezuruigbo bu Jonal nke Ngalaba Amumamu Igbo, Afrika na Nzikoritaozi, Mahadum Nnamdi Azikiwe, Oka. Aha a bu okwu Igbo nke putara "Ihe jezuru ebe niile". Ude ya na-edezu na mba niile site na Googul na Ntaneeti. Nke a mere na Jonal a, di ka aha ya gosiputara, metutara mmadu niile na mba niile. Ebumnuche Jonal Odezuruigbo hiwere isi n'ime ka a mara na o di mkpa iji asusu Igbo deputa edemede nchocha e nyochara nke oma. Nke a ga-enye aka n'ikwalite asusu Igbo, ma mee ka o na-eto eto. O na-anabatakwa edemede e dere na Bekee nke na-ewelite ogo asusu, omenala, amamihe, nsirihu uwa na njirimara ndi Igbo. Nke a putara na o na-anabata edemede n'atumatu o bula metutara odimma ndi mmadu, akuko ntoala, mmekorita mmadu na ibe ya, agumagu, ekpemekpe, omenala, agumakwukwo, ochichi, nkanuzu, w.d.g.
Editor-in-Chief
Prof. Nkoli M. Nnyigide
Editors
Rev. Fr Dr Patrick I. Umezi
Dr. Florence U. Ibeh