EJIJE IGBO NA NDU NDI IGBO N'OGE GBOO NA OGE UGBUA: NSOGBU NA OLILEANYA

Ikechukwu Okodo & Ekwenugo, Precious Ujunwa

Abstract


Ejije Igbo bu otu uzo puru iche ndi Igbo si eziputa omenala na nkwenye ha. Mana taa, ufodu ndi Igbo, okachasi umuntakiri ndi na-eto eto anaghizi enwe mmasi na ya. Nke a kpatara na ejije Igbo ahapula n'ama na obom ebe a na-egosiputa ya n'oge gboo ma banyezia n'ihe nkiri televishonu. O bu eziokwu na nke a bukwa mwuli elu okputorokpu nye ejije Igbo mana nsogbu bu na ufodu ihe ndi ha na-egosiputa na ya abughi nkwenye na omenala ndi Igbo. Aruruala di iche iche di ka; mmadu igba oto, igwo ogwu na igbagbu mmadu. Ha na-agwokorikwa asusu di iche iche. Ebumnobi nchocha a bu ka e nyochaa ejije Igbo na ndu ndi Igbo n'oge gboo na n'oge ugbu a ma ziputa ha di ka nkuzi nke obula si di, iji mata nke na-egosiputa nkwenye na omenala ndi Igbo bu ihe mmuta ejije Igbo na-egosiputa. A gbasoro usoro sovee risaachi mee nchocha a. A gara n'oba akwukwo ma gbakwaa ndi mmadu ajuju onu gbasara ejije Igbo. A gbasoro atutu odidi na nchocha a, n'ihi na o bu ya dabara nke oma n'ileba anya n'ihe ndi e ji mara agumagu di ka, nhazi, asusu, agwa na ihe niile gbasara agumagu ahu n'onwe ya. A choputara na ihe nkiri ejije umuaka na-ekiri na-agbanwe omume ha n'uzo ebimndu ha n'ihi na ihe obula nwata na-ekiri na-abanye ya n'isi ozigbo. Ozo bu na otutu ejije ndi gosiputara nkwenye na omenala ndi Igbo kpomkwem, di ka o kwesiri igbazi ndu na ikuzi ezi akparamagwa, di otutu n'onuogugu ha ji asusu Bekee kuputa. O bu eziokwu na egwu niile, ufodu akuko ifo, ilu ufodu na aha niile ha zagbadoro n'ejije ndi ahu bugbado n'asusu Igbo. Ufodu agwa so n'ejije ndi ahu abuchaghi ndi Igbo.Nchocha a ga-atunye utu nke ya n'ihe gbasara amumamu ejije Igbo. O ga-aburu ndi ga-eme nchocha n'isiokwu a ebe mgbakwasa ukwu ma mee ka aruruala di iche iche a na-ahuta n'ejije Igbo n'oge ugbu a belata. Onye nchocha na-atunye aro ka ndi na-emeputa ejije Igbo mewaga ejije Igbo ghara idi na-enomite obibi ndu ndi ocha nke abughi obibindu e ji mara ndi Igbo. Ozo bu na onye nchocha na-ario ka ndi guru asusu Igbo na ndi nwere mmasi gbasara iwulite asusu na omenala ndi Igbo tinye anya n'ihe nkiri obodo anyi ma riokwazia enyemaka ndi goomenti maka nkwado ihe nkiri o kachasi ndi metutara nkwenye na omenala Igbo, ma kaba ahu chikoba ogbako bu ndi ga na-ahu maka ejije ndi Igbo, mara ma o bukwa nke na-akuzi ihe, nye ndumodu, katoo agwa ojoo ma tokwaa agwa oma tupu ha enye ikike ikuputa ya n'ihe nkiri televishonu. Nke a ga-eme ka e nye ejije odinala Igbo ogo ruru ya ma mekwaa ka ndi ala anyi bido inwe mmasi na ya ozo.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.