NNYOCHA LINGWISTIK MKPARITAUKA: MKPARITAUKA WASAP DI KA IHE NLERE ANYA
Abstract
Nchocha a lebara anya na mkparitauka owa ozi wasap iji choputa mkpuruokwu ohuru ndi a na-ejizi akparita uka. E nwere mkpalite ime nchocha a n'ihi nsogbu otutu ndi mmadu na-enwe n'ighota mkpuruokwu e ji akparita uka n'owa ozi wasap. Ebumnobi nchocha a bu ichoputa mkpuruokwu o gbara ohuru di iche iche e ji enwe mmekorita n'owa ozi wasap nke ndi mmadu anaghi aghotacha na imata ebe di iche iche ha na-abanye n'owa wasap. Ozo, ka a mata ogbatauhie ndi nwere ike idi n'iji akara ndi a were kpaa nkata n'owa ozi wasap na uzo a ga-esi gbochie ogbatauhie ndi ahu. Usoro nchocha a gbasoro bu nke nkowa. E sitere n'owa intaneti nakwa ajuju a gbara ufodu mmadu nwete ngwa nchocha. A choputara akara ndi mmadu anaghi aghotacha, ufodu n'ime ha bu: LOL, LLL, LMAO, TGIF, FYI, ROFL na NVM. A kowara ihe mkpuruokwu ndi a putara na na ebe ha na-abata na mkparita uka wasap. Nchocha a ga-abara onye o bula uru ighota mkpuruokwu ndi a n'ihi na e ji Igbo Izugbe deputa mputara nchocha. O ga-enye aka ka ndi mmadu mara mkpuruokwu di iche iche e ji akparita nkata n'owa ikuku wasap na mputara ha.
Full Text:
PDFRefbacks
- There are currently no refbacks.