MKPA O DI IZULITE UMUAKA N'ISU ASUSU IGBO
Abstract
Ihe nuru ochocha oku n'obi ibagide na nchocha a bu na so ndi okenye ka a na-ahuzi n'otutu obodo n'ala Igbo taa na-asu asusu Igbo. Otutu umuaka Igbo amaghi ka e si asu ma ya foduzia ide asusu Igbo. Ihe kpatara nke a bu n'ihi na nne na nna ndi umuaka ndi a no n'okpuru ha anaghi ekwe ka umuaka muta ma o bu suo Igbo. Udi agwa ojoo a juru ma n'obodo mepere emepe ma nke emepeghi emepe. Nkowa a ziputara na nwa o bula a muru zuru oke nwere ngwa di ya n'uburu nke o ga-eji amuta asusu. N'ihi nke a, o di oke mkpa isite na nwata dubanye nwata n'asusu ebe a munyere ya. Nke a ga-enyere ya aka imuta asusu o bula e buru uzo rupunye n'ime ya. O ga-enyekwara ya aka ka o muta ihe ndi ozo o kwesiri imuta mgbe o na-eto. A gbasoro usoro sovee wee mee nchocha a. Nchoputa gosiri na o buru na udi onodu a adiri gawa, a gaghi enwe mmasi n'asu ma ya fodu ide asusu Igbo n'ihi na mgbe ndi okenye na-asu Igbo nwuchaara, asusu Igbo ga-esokwara nwuo pii; mgbe ahu ihe a na-afu apiaa. Alo ochocha wee buru na ndi Igbo puru igbanahu onwu asusu ha ma o buru na e bido na nwata mee ka umuaka Igbo nwee mmasi isu, igu na ide asusu Igbo. Ha ga na-eme nke a ma n'ezinaulo, n'ulo akwukwo, ulo uka, ulo oru, ulo ahia na ebe niile ha nwetara onwe ha. Ime nke a ga-enyere aka ime ka asusu Igbo digide ghara inwu.
Full Text:
PDFRefbacks
- There are currently no refbacks.