NZIPUTA MKPEBI NKE ONWE NA MMETUTA YA NA NDU N'EJIJE NDI A HOORO

Anagor, Chioma Chiazom; Nkechinyere Nwokoye

Abstract


Inwe mkpebi b? ihe onye ?b?la na-eme na nd? ya. E nwere mkpebi d? mma na nke d? nj? mana nch?cha a lebara anya na nd? d? nj? nke na-ebute akparamaagwa d? a?aa nke a magh? ebe ? ga-eduba onye ah? n’?d?niihu ma?b? ihe ? ga-ebutere ya ma?b? nd? ?z? n’?z? nd? ha. ?t?t? enweela mkpebi megidere ?d?niihu ha na nke ?m? ha n’ihi na ha echemigh? echiche ime banyere ?n?d? ha h?r? onwe ha n’ime ya. Naan? ihe ha ch?r? b? ka ha mezie ?n?d? ha ugbu a n’ihi na echi ga-echere onwe ya mana ogee chi b?ara, ha ah? na ? b?gh? ihe isi ha ga-ebunwu. O nwere ike were nd? mmad? ebe a na-ach? ?z? mgbap? d? ka nd? ntorob?a oge a na-ekpebie ime ihe ?b?la ha nwere ike ime iji bute ego ?s?kwa ya b?r? ihe ga-ewe isi nd? ezina?l? ha, ha ?ch?gh? ?ma. Ya mere nd? nch?cha a ji lebaa anya n’isiokwu a iji zip?ta ?gh?m inwe mkpebi ?j?? na-ebute n’ikpeaz? ka onye ?b?la gbaa mb? chemie echiche ime tupu ha e kpebie ihe ?b?la ka a gbanar? ngaramara n’ikpeaz?. Ihe nd? a niile mere nd? nch?cha ji h?r? ejije Nwata Rie Aw?, Ije ?wa na Adaak? iji zip?ta ka nd? odee ejije Igbo nd? a si ezip?ta mkpebi onwe na mmet?ta ya na nd?. Nd? nch?cha gbasoro Usoro nk?wa ma were at?t? saikoanalisis nke Sigmund Freud t?p?tara n’af? 1895 iji mee ka isiokwu a doo anya. Ha ch?p?tra na e nwere ihe kpatara mmad? ji akpa ?f?d? agwa ma?b? nwee mkpebi d? a?aa na nd?, nke na-ab?kar? n’ihi ?n?d? ? h?r? onwe ya n’ime ya. Nke a mere o ji d? mkpa ka onye ?b?la lebaa anya n’?d? mkpebi ? na-enwe banyere ?n?d? ?b?la n’ihi na ? nagh? ad?gide. ? d?gh? ?n?d? ma?b? ihe mmad? na-agabiga enwegh? ?z? mgbap?ta, mana ? b?r? na onye ah? mee ngwangwa inwe mkpebi, ? ga-emebi ihe na ngw?cha nke ga-aj?kar? udele ma sikar?a nkakw?.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.