Ntulekorita Nkomiriko N'aku Fechaa Na Nwata Rie Awo Di Ka O Siri Metuta Ogbo Globalaizeshon A

Chigozie Aloysius Otti & Obiageli T. Nsolibe

Abstract


Edemede a lebara anya n'itulekorita akwukwo ejije abuo ndia: Aku Fechaa nke Anelechi B. Chukwuezi dere na Nwata Rie Awo nke Goddy O. Onyekaonwu dere. Ejije bu njije a na-ejije mmadu maobu ihe ekere uwa site n'agwa maobu odidi ihe ndi ahu site na ka e siri kee ha. Aku Fechaa bu ejije na-ekwu na anaghi agbagha mmuo okwu, ebe Nwata Rie Awo na-ekwu maka Aworo, dimgba chupuru nwunye ya, luru ada ya nwaanyi n'amaghi ama. Nwanchocha ga-esite n'usoro atutu nnyocha agumagu nkomiriko wee tuchaa ejije ederede a hooro. Nkomiriko bu akuko odinaala ndi Igbo nwere, ndi ahu na-eziputa ihe omimi di iche iche dika okike, nkwenye, omenaala, onwu, chi, ndu ndi odogwu, dgz. Ndi odee ufodu n'oge ugbua na-ala azu n'ime ka akuko odinaala Igbo na-aputawanye ihe. O bu ufodu ndi odee oge gboo bu ndi gbara mbo ihu na akuko odinaala ndi a putawagara ihe site n'iziputa ha n'oru ekereuche ha. Mana n'oge ugbu a, a choputara na ufodu akuko odinala ndi Igbo na-adaghachizi azu ma na-anwukwa anwu n'ihi akparamagwa ojoo ndi Igbo na-akpaso asusu, agumagu na omenala Igbo. Ozo bu na ufodu ndi Igbo na-agbaziri igosiputa omenaala Igbo oso. Ihe ndia niile na-eweta ndaghachi azu n'ebe nkwenye na odinaala no. A gaghi eleghara anya n'igosiputa ka nkomiriko siri metuta ogbo globalaizeshon a na ihe nleghara anya niile ogbo globalaizeshon a buteere omumu ihe gbasara ejije ederede Igbo dika o siri metuta nziputa nkomiriko. O bu ihe ndi a niile bu nsogbu kpaliri mmuo nwanchocha ime nchocha a. Ya mere, edemede a na-enyocha nkomiriko Igbo e ziputara n'Aku Fechaa na Nwata Rie Awo. E nyochakwara ufodu ederede nchoputaga dabara n'isiokwu a. Nkomiriko e ziputara n'Aku Fechaa bu nke gosiputara akpamike chi, ebe Nwata Rie Awo ziputara nkomiriko Aru na mmeru ala nke gosiputara onwe ya na ndu Aworo. Nkomiriko e ziputara n'ejije abuo a na-arutu aka na nkwenye ndi Igbo. A gbasoro atutu nnyocha agumagu nkomiriko n'itucha ejije ederede a hooro ma nyochakwaa ufodu ederede nchoputaga dabara adaba n'isiokwu a. A turu anya na ederede a ga-enye aka mee ka ihe gbasara nkomiriko n'ejije ederede Igbo dowaga ndi oguu na ndi niile nwere mmasi n'ebe ejije Igbo di anya. Udi nchocha e mere bu ntulekorita, I ji choputachaa mgbanwe di n'etu o di n'oge ugbu a. A choputara na nkomiriko na-enye aka iweputa odinaala n'ejije ederede Igbo. Nchocha a ga-enyere ma ndi nkuzi ma umuakwukwo aka. O bukwa aro nwanchocha na ndi Okammuta na ndi nchocha iga n'ihu imewaga nchocha n'ihe gbasara ejije Igbo.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.