Dike Ajaala Umudara Ihiala Di Ka Chi Ofufe

Ezesinachi, Juliet Ngozika; Anyachebelu, Adaora L; Ilechukwu Hypolite Chinaza

Abstract


Nchocha a lebanyere anya n'ihe gbasara arusi a na-akpo Dike Ajaala n'Um?dara Ihiala, nke di n'okpuru ochichi Ihiala nke di na steeti Anambra. Mbunuche nchocha a bu ichoputa ihe omimi gbasara Dike Ajaala Umudara Ihiala na ihe mere e ji akpo ya aha a tinyekwara ime nchekwa gbasara ya. Atutu e jiri ruo oru na nchocha a bu atutu odidichi. Usoro e si wee nweta ngwaoru e jiri ruo oru na nchocha a bu ajuju onu. A gbara ufodu ndi okenye ndi sitere n’akuku Ihiala ebe a na-akwanyere Ajaala ugwu ajuju onu Nd? okenye ndi a bu ndi a turu anya na ha ga-enye aziza ga-enyere ndi nchocha aka ihoputa ihe ha na-acho. Usa ha nyere nyeere aka ihazi nchocha a ka o wee dika o kwesiri. N'ohia nchocha a, any? choputara na ndi Umudara na-aso igha aja n'udi obula tumadi n'ebe di na nwunye no. Ihe ozo anyi choputara bu na arusi a nwegairi oru puru iche o na-aru n'obodo. O bukwa oru ndi ahu mere ha ji akwanyere ya ugwu. N'ikpeazu, nkwenye ha nwere banyere Dike Ajaala ka di ire ruo taa. O bu ya mere ha ji na-efe ya wee ruo taa n'agbanyeghi ihe ima aka n'ihu o nwetara site n'aka ndi uka.


Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright © 2015-2019. IJAAS. All Rights Reserved.

ISSN:2504-8694, E-ISSN:2635-3709Â