Nzipụta Ịgba Alụkwaghịm Na Ndụ Ụmụnwaanyị N’Iduuazị Igbo

Okafor Ebele Eucharia

Abstract


Ịgba alụkwaghịm so n’otu omenala a na-eme n’ala Igbo. Ọ na-apụta ihe mgbe nwoke mọọbụ nwaanyị achọghịzị alụmdi na nwunye ibe ya. N’agbanyeghi na ịgba alụkwaghịm bụ omenala ndị Igbo na-eme, ha anabatachaghị ya ka ihe dị mma mọọbụ ihe ha chọrọ ka a na-eme n’ihi mkposasị ezinaụlọ na mkposasị obibindụ ọ na-ewetara nwoke, nwaanyị, nakwa ụmụaka. Edemede a ga-atụle iduuazị Nkọlị nke Nzeakọ (1973), Kọdịlịchukwu nke Obidiebube (2006), na Onye Chi Ya Akwatughi nke Ofomata (2006) iji gosipụta ma kọwaa gbasara ịgba alụkwaghịm n’ala Igbo na etu o si emetụta ndụ ụmụnwaanyị. A họọrọ iduuazị ndị a n’ihi na ha wepụtara ọnọdụ ụmụnwaanyị na-anọ mgbe a gbara ha alụkwaghịm. A gbadoro ụkwụ n’atụtụ nke mgbasa alụmalụ na nke nwàanỳịzie wee nyochaa iduuazị ndị a. A chọpụtara n’iduuazị ndị a na nwoke mọọbụ nwaanyị nwereike ịgba ibe ya alụkwaghịm n’ala Igbo. Nwoke nwereike ịgba nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ajọ omumue ya, amụtaghị nwa, mọọbụ maka na ọ chọghịzị ịlụ nwunye ya na-enweghị ihe kpatara ụdị mkpebi ahụ. Nwaanyị nwekwaraike ịgba di ya alụkwaghịm n’ihi agwa ọjọọ ọ na-akpaso ya maka na ọ mụtaghị nwa. N’agbanyeghị etu e siri gbaa alụkwaghịm, Nzeakọ na Obidiebube gosipụtara na nwaanyị di ya gbara alụkwaghị m na-ata oke ahụhụ nke nwere ike ibutere ya na nwa ya ọrịa mọọbụ ọnwụ ebe Ofomata gosịpụtara na nwoke nwunye ya gbara alụkwaghịm na-atakwa ahụhụ n’onwe. Ọ gakwara n’ihu gosipụta na e nweela nnukwu ihe mgbanwe n’ebe ndụ ụmụnwaanyị a gbara alụkwaghịm dị, ọkachasị ndị nwere akaọrụ na ndị dị ike ọrụ. N’agbanyeghị na ụfọdụ ụmụnwaanyị kpatara ego anaghị ata oke ahụhụ ma ha pụọ na di, ịgba alụkwaghịm abụghị ihe dị mma n’ezinaụlọ n’ihi nsogbu ọ na-ebutere ndị nne na nna, ọkachasị nwaanyị na ụmụaka. N’ihi nke a, a ga-atụpụta ụzọ e nwereike isi kwụsị mọọbụ belata ịgba alụkwaghịm n’ezinaụlọ.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright © 2015-2019. IJAAS. All Rights Reserved.

ISSN:2504-8694, E-ISSN:2635-3709Â