Ntụcha Ụfọdụ Usoro Mmebeokwu na Okwu Ụfọdụ Gbasara Korona Vaịrọs N’asụsụ Igbo (Analysis of Igbo Words Associated With Corona Virus)

Felista Akidi, Chioma Ayozie, Andrew Mgborogwu & Faith Obumneke

Abstract


Korona vaịrọs bụ nje ọrịa yinyere ụwa niile egwu bido n’afọ 2019 wee kachazie njọ n’afọ 2020. Iji belata ofufe ya na igbochi ya kpọmkwem, e wepụtara okwu dị iche iche. Okwu ndị a ka e ji kọwapụtara ndị mmadụ ụzọ kacha mma ndị mmadụ ga-eji zeere maọbụ gbochie nje a ịgbasa. Mbunuuche nchọcha a bụ ileba anya na mkpụrụokwu ndị gbasara nje ọrịa a, mpụtara ha, usoro mmebeokwu ha, katigori ụtọasụsụ ha dabara. Usoro e ji mee nchọcha a bụ usoro kwọlitetiv. E si n’akụkọ ụwa Orient, my Radio na Ozisa FM, Owerri wee weta ngwa e ji tụchaa nchọcha a. E mere nke a site n’ige akụkọ ụwa sitere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị a ugboro ugboro.A gbadoro ụkwụ n’atụtụ mkpụrụokwu usoro okwu wee mee nnyocha nchọcha a. Atụtụ a na-ekwu na usoro mmebeokwu niile na-agbado ụkwụ na mkpụrụokwu ka e ji tụchaa okwu ndị gbasara nje korona, usoro mmebeokwu ha na katigori ụtọasụsụ ha. A chọpụtara na atụtụ a e ji mee nchọcha a dabara na ntụcha isiokwu nchọcha a.A chọpụtara na usoro mmebeokwu nsụgharị kachabụrụ usoro okwu pụtara ìhè, aha bu katigori ụtọasụsụ kachakwa pụta ihe. Nchọcha a ga-abara ndị ọzọ ga-eme nchọcha n’isiokwu a uru, ka ha ghọta ihe okwu ndị gbasara nje korona, mata ụdị mmebeokwu mkpụrụokwu ndị a bụ.Nchọcha a ga-etinyekwu ihe na ntụlegharị agụmagụ mmebeokwu na usoro mmebeokwu, deregawa. A tụrụ alo ka ndị ọzọ mekwuo nchọcha n’ihe yitere isiokwu a iji chọpụtakwuo ihe ndị nchọcha a achọpụtaghị.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright © 2015-2019. IJAAS. All Rights Reserved.

ISSN:2504-8694, E-ISSN:2635-3709Â