NTUCHA UFODU USORO MMEBEOKWU NA OKWU UFODU GBASARA KORONA VAIROS N'ASUSU IGBO (Analysis of Igbo words Associated with corona virus)
Abstract
Korona vairos bu nje oria yinyere uwa niile egwu bido n'afo 2019 wee kachazie njo n'afo 2020. Iji belata ofufe ya na igbochi ya kpomkwem, e weputara okwu di iche iche. Okwu ndi a ka e ji kowaputara ndi mmadu uzo kacha mma ndi mmadu ga-eji zeere maobu gbochie nje a igbasa. Mbunuuche nchocha a bu ileba anya na mkpuruokwu ndi gbasara nje oria a, mputara ha, usoro mmebeokwu ha, na katigori ?t?as?s? ha dabara. Usoro e ji mee nchocha a bu usoro kwolitetiv. E si n'akuko uwa Orient, my radio na Oziza FM, Owerri wee weta ngwa e ji tuchaa nchocha a. E mere nke a site n'ige akuko uwa sitere n'ulo oru mgbasa ozi ndi a ugboro ugboro. A gbadoro ukwu n'atutu mkpuruokwu usoro okwu wee mee nnyocha nchocha a. Atutu a na-ekwu na usoro mmebeokwu niile na-agbado ukwu na mkpuruokwu ka e ji tuchaa okwu ndi gbasara nje korona, usoro mmebeokwu ha na katigori utoasusu ha. A choputara atutu a e ji mee nchocha a dabara na ntucha isiokwu nchocha a. A ch?p?tara na usoro mmebeokwu nsughari kacha buru usorookwu putara ihe, aha bu katigori utoasusu kachakwa puta ihe. Nchocha a ga-abara ndi ozo ga-eme nchocha n'isi okwu a uru, ka ha ghota ihe okwu ndi gbasara nje korona,mata udi mmebeokwu mkpuruokwu ndi a bu. Nchocha a ga-etinyekwu ihe na ntuleghari agumagu mmebeokwu na usoro mmebeokwu, deregawa. A turu alo ka ndi ozo mekeuo nchocha n'ihe yitere isiokwu a iji choputakwuo ihe ndi nchocha a achoputaghi.
Full Text:
PDFRefbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright © 2015-2019. IJAAS. All Rights Reserved.
ISSN:2504-8694, E-ISSN:2635-3709Â