Asusu Igbo: Enyo Ngosiputa Ndu na Njirimara Ndi Igbo
Abstract
Nchcha a bu maka asusu Igbo: enyo ngosiputa ndu na njirimara ndi Igbo. Ihe nwanchocha bu n’obi bu igosiputa etu asusu Igbo si egosiputa ndu na njirimara ndi Igbo. Ihe kpalitere nwanchocha ime nchocha a bu na otutu umuafo Igbo ejizighi asusu Igbo kporo ihe. O bu maka nke a ka nwanchocha ji choo ime nchocha a iji gosiputa na o bu n’asusu Igbo ka ndu na njirimara ndi Igbo gbadoro ukwu. Ya bu na e wepu asusu Igbo, a mara na ndu ndi Igbo enweghi isi. A bia n’omenala Igbo, tupu ufodu emume adi ire, a ga-ejiriri asusu Igbo mee ha, di ka emume oji na emume ndi ozo. Ya bu na echiche ndi Igbo naagbado ukwu n’asusu Igbo. Mgbe e mechara nchocha a, a choputara uzo di iche iche asusu Igbo si eziputa ndu na njirimara ndi Igbo. A choputakwara na e nwegasiri ihe ndi bu ihe mkpobi ukwu nye uto na mgbasa asusu Igbo. E lebakwara anya n’ihe ndi e merela iji kwalite onodu asusu Igbo n’ala Igbo na n’ebe ndi ozo di iche iche na senturi nke iri abuo na otu. Ihe ozokwa a choputara bu ihe ndi a ga-eme iji kwalite onodu asusu Igbo n’ogo di elu. E bu n’uche na mputara nchocha a ga-eweta mgbanwe n’echiche umuafo Igbo gbasara asusu Igbo, ma mee ka ndi Igbo hu asusu ha n’anya ma na-asukwa ya n’ebe niile. Ya bu na ndi Igbo kwesiri ikuli kwalite, chekwaa ma na-asukwa asusu Igbo; maka na asusu bu ndu na njirimara mba.
This paper is about Igbo language as a reflection of Igbo life and identity. Having observed the high rate of decline in the use of Igbo language among the people of Igbo origin, the researcher was motivated to research and bring to light how the Igbo language stands as the mirror that reflects the life and identity of the Igbo people. As such, to lose Igbo language amounts to loss of the life and identity of Igbo race. In Igbo land, the validity of some cultural ceremonies lies in the ceremony being conducted in Igbo language. Example is the ceremony of kola nut. At the end, the research proved that Igbo language is the mirror that reflects the Igbo life and identity of Igbo people in different ways. It also shows different factors militating against the progress of Igbo language. Furthermore, there was a look at the efforts made in twenty-first century to promote Igbo language in Igbo land and beyond. Finally, the research suggested ways to promote the Igbo language to a higher level. By and large, the Igbo people should guide, promote and protect Igbo language because extinction of the language means the extinction of Igbo identity.
Full Text:
PDFRefbacks
- There are currently no refbacks.