OKWU OHURU N'ASUSU IGBO: UFODU IHE NDI NA - EWETA OKWU OHURU NA USORO MMEBEOKWU HA

Felista Chidi Akidi

Abstract


Ka uwa n'emepe na - aga, ichoputa na inabata ihe ohuru di iche iche, na-eme ka okwu ohuru na-abata n'asusu Igbo. Okwu ohuru a na-ahu n'asusu Igbo site n'oge rue n'oge kpalitere nchocha a. Nchocha a bu nke kwolitetiv. Ulo oru mgbasa ozi abuo ka e si weta ihe e ji tuchaa nchocha a. Mmadu abuo ka a juru ajuju a na-akwadoghi akwado. Nke a bu iji ghota mp?tara ufodu okwu ohuru ndi n'edoghi anya n'okwu ohuru ndi e nwetara e ji mee Ntucha. E ji akwukwo na mkpisi edemede wee detuo okwu ohuru  ndi e nwetara. Mbunuuche nchocha a bu imata ihe ndi na-ewebata okwu ohuru n'asusu Igbo na usoro mmebeokwu ha dabara. A choputara na okwu ohuru  na-esite  n'uzo di iche iche abata n'asusu Igbo. Uzo ndi a gunyere, nkanuzu, ejiji, agu akwukwo, okpukperechi, nsogbu na erimeri. A choputakwara na usoro mmebeokwu e ji mebe okwu ohuru ndi a gunyere : nsughari, ngwako, nkwuko, mgbati echiche, ime okwu ejima na okwu mbite. A turu alo ka a na-eji okwu ohuru ndi nke a sughariri n'Igbo na-emekorita karia iji nke bekee ha.


Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.