Okwu Ọhụrụ N’asụsụ Igbo: Ụfọdụ Ihe Ndị Na-Eweta Okwu Ọhụrụ Na Usoro Mmebeokwu Ha

Felista Chidi Akidi

Abstract


Ka ụwa n’emepe na-aga, ịchọpụta na ịnabata ihe ọhụrụ dị iche iche, na-eme ka okwu ọhụrụ na-abata n’asụsụ Igbo. Okwu ọhụrụ a na-ahụ n’asụsụ Igbo site n’oge rue n’oge kpalitere nchọcha a. Nchọcha a bụ nke kwọlitetiv. Ụlọọrụ mgbasa ozi abụọ ka e si weta ihe e ji tụchaa nchọcha a. Mmadụ abụọ ka a jụrụ ajụjụ a na-akwadoghị akwado. Nke a bụ iji ghọta mpụtara ụfọdụ okwu ọhụrụ ndị n’edoghị anya n’okwu ọhụrụ ndị e nwetara e ji mee ntụcha. E ji akwụkwọ na mkpịsị edemede wee detuo okwu ọhụrụ ndị e nwetara. Mbunuuche nchọcha a bụ ịmata ihe ndị na-ewebata okwu ọhụrụ n’asụsụ Igbo na usoro mmebeokwu ha dabara. A chọpụtara na okwu ọhụrụ na-esite n’ụzọ dị iche iche abata n’asụsụ Igbo. Ụzọ ndị a gụnyere; nkanụzụ, ejiji, agụmakwụkwọ, okpukperechi, nsogbu na erimeri. A chọpụtakwara n’usoro mmebeokwu e ji mebe okwu ọhụrụ ndị a gụnyere: nsụgharị, ngwakọ, nkwukọ, mgbatị echiche, ime okwu ejima na okwu mbite. A tụrụ alo ka a na-eji okwu ọhụrụ ndị nke a sụgharịrị n’Igbo na-emekọrịta karịa iji nke bekee ha.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.