NKOWA NA NKOWAAHA N'ASUSU IGBO: NLEBAGHARI ANYA

Chinweude N. Ugochukwu

Abstract


Isiokwu nchocha a lebaghariri anya na nkowa na nkowaaha n'asusu Igbo. E nwere mgbagwoju anya ufodu ndi Igbo na-enwe gbasara nkowa na nkowaaha. Ufodu na-eche na nkowa na nkowaaha bu otu ihe. A choro isite na nchocha a mejuputa ebumnobi ndi a: iziputa mmetuta di n'etiti nkowa na nkowaaha; igosiputa myiri na ndiiche di n'etiti nkowaaha na mkpuruokwu ndi ozo yitere ya; ikowaputa udi nkowa e nwere n'Igbo na ituputa usoro ka mma isi kowaa nkowa na nkowaaha n'asusu Igbo. Udi nchocha e mere bu nke sovee, ebe a gbasoro usoro nkowaputa iji mee ka isiokwu nchocha doo anya. E sitere n'akwukwo utoasusu di iche iche nweta ngwa ndi a tuchara na nchocha a. A choputara na nkowa na nkowaaha nwere mmetuta n'etiti onwe ha; nkowaaha bu otu n'ime udi nkowa e nwere, ebe mkpuruokwu ndi yitere nkowaaha bucha ahankowa nke bu otu n'ime udi aha e nwere n'Igbo. Ndi nkuzi na umuakwukwo ga-erite uru na nchocha a n'ihi na ihe mgbagwojuanya a na-enwe gbasara nkowa na nkowaaha ga-edowanye ha anya. Nchocha a ga-emekwa ka amumamu utoasusu Igbo na-agbawanye mgborogwu.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.