Akukoneegwu Na Ndu Ndi Igbo
Abstract
Otu ihe doro anya bu na akuko mba/agburu obula, di n' uwa, sitere n'agumagu ha. Etu a, ka o di n'ebe agburu Igbo no. Akukoneegwu bu akuko e tinyere n'udi egwu were ziputa. O so n'ime otu uzo mba si egosiputa akparamaagwa di iche iche ohaneze na-akpagasi n'obodo. Ndi Igbo bu ndi bi n'owuwa anyanwu nke mba Naijiria. Ha bu agburu na-ejikari ojii, gbaa di mkpa ma nwee nnukwu egbugbere onu. Ebumnobi nchocha a, bu itule akukoneegwu na ndu ndi Igbo ma si etu ahu kwalite agumagu onu Igbo nke akukoneegwu bu otu n'ime ha. Iji mee ka nchocha a nye ihe a choro, nchocha a gbasoro atutu kiritikal Diskosu Analisisi. Site n'inyocha akukoneegwu ufodu ndi Igbo, a choputara na akukoneegwu bara otutu uru na ndu ndi Igbo. Ufodu uru ndi ahu gunyere ndi a: O bu uzo e si agwa ndi mmadu ihe ojoo ha na-eme ka ha si na ya wee wezuga onwe ha. Akukoneegwu na-eme ka mmadu mara ihe mere unyaa, nke na-eme ugbua, na nke nwere ike ime echi. Na nchikota, nchocha a tutara aro ka a na-enwe ogbako ndi akukoneegwu kwa mgbe kwa mgbe, iji si etu a, na-atute odinaala ndi Igbo. N'otu aka ahukwa, nchocha a ziputakwara aro ozo site n'ikwu na o di mkpa ka nwaala Igbo obula gbaa mbo ole o nwere ike n'itunye utu nke ya n'udi obula iji kwalite ma mee ka akukoneegwu n'obibi ndu ndi igbo buru akwaa akwuru n'ala Igbo nakwaa mba uwa gbaa gburu gburu.
Full Text:
PDFRefbacks
- There are currently no refbacks.