OKE OCHICHO NA NSOGBU YA: NZIPUTA YA N’IDUUAZI NA EJIJE NDI A HOORO

Ani, Nnamdi & Nkechinyere Nwokoye

Abstract


Nchocha a gbadoro ukwu n'oke ochicho na nsogbu ya na ndu ndi Igbo di ka e si ziputa ya n'iduuazi na ejije ederede Igbo ndi a hooro. Oke ochicho aburula otu ihe a na-ahu n'ala Igbo n'oge a n'ihi na ihe ufodu mmadu nwere anaghizi ezuru ha ebe ufodu choro ego mbute. Ufodu banyere otu nzuzo, ufodu zuwe ohi, towa mmadu iji kpata ego, ufodu napuwa nwanne ha ihe o nwere n'ihi anya ukwu. Nke a na-eweta otutu nsogbu. Onodu oke ochicho na ndu ndi Igbo n'oge a, akpalitela ndi odee iduuazi na ejije Igbo, igosiputa otutu nsogbu di iche iche di n'inwe oke ochicho. Nke a kpalitere mmuo nwa nchocha n'ileba anya n'Oku Ghara Ite na Ukpana Nti Ike, iji ziputara ohanaeze otutu nsogbu na-esi n'inwe oke ochicho aputa. Nchocha a gbadoro ukwu n'atutu nghota oguu wee tuchaa akwukwo iduuazi na ejije ederede ndi a hooro. O gbasoro usoro nkowasi wee ziputachaa nsogbu ndi ahu di ka ha putachara ihe n'iduuazi na ejije ndi ahu. Nchocha a choputara na a na-esite n'inwe oke ochicho kwafuo obara otutu mmadu, tinyere otutu nsogbu ndi ozo. O ga-abara ndi mmadu uru, maka na onye na-enwe oke ochicho, ga-esite na nsogbu ndi ahu e deputara, gbaso inwe afo ojuju n'ihe o nwere. Nwanchocha na-atunye aro ka ndi Igbo na-enwe afo ojuju n'ihe ha nwere karia itajiri mmadu anya. O ga-akpalite mmuo ndi oguu n'ebe iduuazi na ejije ederede Igbo di.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright © 2015-2019. IJAAS. All Rights Reserved.

ISSN:2504-8694, E-ISSN:2635-3709Â