Ịnụ Iyi: Achụmachụ E ji Achọpụta Eziokwu N’agụmagụ Igbo ndị a họọrọ

Chioma R. Ayozie, Andrew C. Mgborogwu, Faith C. Obumneke

Abstract


Oke mmepe anya na ọbịbịa ọchịchị ndị ọlọrọọhụrụ n’ala Igbo, mere ka ndị ọgbọ nọ ugbu a na-eleghara ụfọdụ omenala Igbo anyị dịka ịṅụ iyi anya. E chefuru na ịṅụ iyi bụ nnukwu achụmachụ e ji achọpụta eziokwu ọsịịsọ nke ndị Igbo wepụtara tupu ọchịchị ndị ọlọrọọhụrụ abata iji were na-echekwa, achịkwa ma na-edozi esemokwu ọbụla dapụtara n’obodo. Mwebata ụlọikpe nke ndị ọchịchị ọlọrọọhụrụ webatara, mere ka a na-eleghara ịṅụ iyi anya. Nleghara anya a na-eleghara ịṅụ iyi, mere ka nsogbu dịka ebubo ụgha, mpụ, asị, esemokwu, ohi, ịgwọ ọgwụ ọjọọ na arụrụala na-abawanye n’ala Igbo. Nsogbu ndị a kpaliri nchọcha a. Mbunuuche nchọcha a bụ ịkọwapụta ihe ndị na-ebute ịṅụ iyi. Agụmagụ Igbo ndị a họọrọ maka nchọcha a bụ: Ọja Dufuo Dike, Ụkpana Okpoko Buuru na Ọchịchị Ekperima. Ngwaọrụ edemede a bụ agụmagụ Igbo ndị a a họọrọ n’edemede ndị ọzọ metụtara isiokwu a. A gbasoro usoro nkọwa wee mee nchọcha a. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ atụtụ saịkoanalisis, nke na-ekwu na e kere agwa dị n’ime mmadụ ụzọ atọ, agwa ndị a bụ ndị na-akwalite mmadụ inwe agụụ ime ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ. A chọpụtara na ịṅụ iyi bụ ụzọ a ga-esi achọpụta eziokwu ọsịịsọ. A tụrụ alo na agbụrụ na-anaghị aṅụ iyi mụrụ ya n’aka ndị Igbo, ndị na-eleghara ịṅụ iyi anya malite lebawa ịṅụ iyi anya, n’ihi na ọ ga-enye aka belata mpụ, ebubo ụgha, asị, ohi na arụrụala dị iche iche n’obodo.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.