NTUTEGHARI EZI AGWA NA ODIBENDI NDI IGBO: ORU DI OKE MKPA

Chinweude N. Ugochukwu

Abstract


Agburu o bula di n'uwa nwere usoro obibi ndu ha nke e nwere ike ikpo odibendi. Usoroobibi ndu a metutara ihe niile gbasara otu agburu nke gunyere nkwenye, nsirihu ndu,akparamagwa, ihe oriri, asusu, uzo mkpata aku, aru na nsoala na ihe ndi ozo. N'ihimmekorita obodo na obodo na ngwakorita odibendi di iche iche site na mmepe naakorongwa ogbaraohuru di iche iche, otutu agburu na-atufu odibendi ha werezieodibendi agburu ozo dochie anya nke ha. Agburu Igbo ketere oke na nsogbu di otu a.Ka o di taa, otutu ihe e jiri mara ndi Igbo na-efunyu anya. Nke a butere nsogbu di icheiche a na-ahu n'ebe di iche iche n'ala Igbo di ka: igba mgbere mmadu, igbu mmadu dika okuko, ikpata ego n'uzo di iche iche jogburu onwe ha, fonfoju akpa, tigbuo nazogbuo udi a na-ahu anya na udi anaghi ahu anya; mmegbu na mmeto ndi ozo ga. E bun'obi ichoputa ihe butere onodu di otu a nakwa etu a ga-esi belata ma o bu gbochie ya.E sitere n'igba ajujuonu akwadoghi akwado nakwa nleru anya choputa na e nweghi afoojuju na oke ochicho; icho iba ogaranya taa na echi; enweghi ugwu na nsopuru nyeomenala ndi Igbo so ebute nsogbu ndi e meturu aka. Edemede a na-akpo oku ka ndiIgbo leghachianya azu, chegharia uche ha, huta na o nweghi uru di n'itufu odibendi ha;ka a malite iweghachi ezi agwa na odibendi ndi Igbo nke a na-echefuzi echefu. Atuputaziri ihe ndi a ga-eme ka e megharia odachi.

Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.