Iji Atutu ncheke tuchaa ngwa "Ri" di ka isi n' ebe ngwaa oriri ndi ozo di

Orji, Ethel Odinakachi

Abstract


Nchocha a lebara anya na ngwaa ‘ri’ di ka n'ebe ngwaa oriri ndi ozo di n’Igbo. Nsogbu nchocha a bu na o dighi ebe e jirila atutu ncheke were tuchaa ngwaa ‘ri’ di ka otu n’ime ngwaa oriri e nwere n’Igbo. Ebumnobi nchocha bu ichoputa ma a ga-ejinwu atutu amumamu ncheke were tuchaa isiokwu a. Ozo bu ichoputa etu ngwaa ‘ri’ siri buru ya bu isi n’ebe ngwaa oriri ndi ozo di. E nwetara ngwaa nchocha site n’igu  akwukwo ogugu ndi e dereela n’ihe metutara  isiokwu a. E jikwa atutu amumamu ncheke were tuchaa ngwa nchocha e nwetara n’emem nchocha a.  A choputara na ‘ri’ di ka otu n’ime ngwaa oriri bu ya kwo ngwaa oriri ndi ozo n'azu. onye na-elo nri na-eri nri. Onye na-ata ji na-eri ji. A choputara na a ga-ejinwu atutu ncheke were tuchaa ngwaa oririn’Igbo. Nwa nchocha na-atu aro ka ndi oka asusu na ndi nchocha ndi ozo were atutu ncheke tuchakwuo ngwa ndi ozo ma deputa ya n’akwukwo iji mee ka onye obula nwere mmasi n' asusu Igbo tumadu n' ebe amumamu ncheke di hu ebe e deturu ya edetu n’akwukwo.


Full Text:

PDF

Refbacks

  • There are currently no refbacks.